5 Ndị isi ndị Filistia wee bịakwute Delaịla, sị ya: “Ghọgbuo ya+ ka ị chọpụta ihe na-enye ya nnukwu ike a o nwere na otú anyị nwere ike isi merie ya, kee ya agbụ ma mee ka ọ ghara ịkpakwa ike. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akwụ gị otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha.”