-
Ndị Ikpe 17:3-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 O wee nyeghachi nne ya otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ. Ma nne ya sịrị: “M ga-edo ọlaọcha a nsọ maka Jehova ka nwa m wee jiri ya mee arụsị a pịrị apị nakwa arụsị a kpụrụ akpụ.+ M na-enyeghachikwa gị ya.”
4 Mgbe o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya weere narị mkpụrụ ọlaọcha abụọ (200) nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe. O mere arụsị a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. E wee dowe ha n’ụlọ Maịka. 5 Nwoke a bụ́ Maịka nwere ụlọ arụsị. O mere efọd+ na arụsị ezinụlọ*+ ma họpụta otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ onye nchụàjà ya.+
-