37 Ha ga na-adagide ibe ha ka à ga-asị na e nwere onye ji mma agha achụ ha ọsọ, n’agbanyeghị na e nweghị onye na-achụ ha. Unu agaghị eguzoli n’ihu ndị iro unu.+
15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
25 Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+