Jenesis 36:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 Elifaz, nwa Ịsọ, nwere iko nwaanyị aha ya bụ Timna. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Elifaz Amalek.+ Ọ bụ ha bụ ụmụ* Eda, nwunye Ịsọ. Ọpụpụ 17:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Ndị Amalek+ bịara lụso ndị Izrel agha na Refidim.+ Ọpụpụ 17:14 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 14 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Dee ihe a n’akwụkwọ ka e wee na-echeta ya, kwughachikwa ya ka Joshụa nụ ya, ‘M ga-ehichapụ ihe niile e nwere ike iji cheta Amalek n’ụwa.’”*+ Ọnụ Ọgụgụ 13:29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 29 Ndị Amalek+ bi n’ala Negeb.+ Ndị Het, ndị Jebus,+ na ndị Amọraịt+ bikwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, ndị Kenan+ ebiri n’akụkụ oké osimiri+ nakwa n’akụkụ Osimiri Jọdan.” 1 Samuel 15:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ndị Amalek zaa ajụjụ maka agha ha lụsoro ndị Izrel n’ụzọ mgbe ha si Ijipt na-apụta.+ 2 Samuel 1:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 1 Mgbe Sọl nwụchara, Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag+ mgbe o merichara* ndị Amalek lọta.
12 Elifaz, nwa Ịsọ, nwere iko nwaanyị aha ya bụ Timna. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Elifaz Amalek.+ Ọ bụ ha bụ ụmụ* Eda, nwunye Ịsọ.
14 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Dee ihe a n’akwụkwọ ka e wee na-echeta ya, kwughachikwa ya ka Joshụa nụ ya, ‘M ga-ehichapụ ihe niile e nwere ike iji cheta Amalek n’ụwa.’”*+
29 Ndị Amalek+ bi n’ala Negeb.+ Ndị Het, ndị Jebus,+ na ndị Amọraịt+ bikwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, ndị Kenan+ ebiri n’akụkụ oké osimiri+ nakwa n’akụkụ Osimiri Jọdan.”
2 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ndị Amalek zaa ajụjụ maka agha ha lụsoro ndị Izrel n’ụzọ mgbe ha si Ijipt na-apụta.+