20 Benaya,+ nwa Jehoyada, bụ nwoke obi kara.* O mere ọtụtụ ihe na Kabzil.+ O gburu ụmụ nwoke abụọ Ariel onye Moab mụrụ. Ọ bụkwa ya banyere n’olulu mmiri gbuo ọdụm n’otu ụbọchị snoo na-ada.+
5 Onyeisi ìgwè nke atọ bụ Benaya+ nwa Jehoyada,+ onyeisi nchụàjà. E kenyere ha ije ozi n’ọnwa nke atọ. Puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000) nọkwa n’ìgwè ya.