Abụ Ọma 7:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Ọ ga-eji isi ya buru nsogbu ọ na-akpata.+ Arụrụala ọ na-arụ ga-ala ya n’isi. Abụ Ọma 55:23 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 23 Ma Chineke, ị ga-eme ka ndị ahụ ikpe ọbara mara na ndị na-aghọ aghụghọ banye n’ili.+ Ha agaghị anọru ọkara ndụ ha.+ Ma m ga-atụkwasị gị obi. Ilu 5:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ ma n’ọnyà. Mmehie ọ na-eme ga-eke ya agbụ.+
23 Ma Chineke, ị ga-eme ka ndị ahụ ikpe ọbara mara na ndị na-aghọ aghụghọ banye n’ili.+ Ha agaghị anọru ọkara ndụ ha.+ Ma m ga-atụkwasị gị obi.