-
2 Ihe E Mere 14:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Esa rịọziri Jehova bụ́ Chineke ya,+ sị: “Jehova, ị chọọ inyere ndị mmadụ aka, ị ga-enyere ha aka, ma hà dị ọtụtụ ma hà dị ole na ole, ma hà siri ike ma ọ bụ na ha esighị.+ Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị tụkwasịrị gị obi.+ Anyị jikwa aha gị na-alụso ìgwè mmadụ a agha.+ Jehova, ị bụ Chineke anyị. Ekwela ka mmadụ efu merie gị.”+
-
-
2 Ihe E Mere 20:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Jehoshafat wee bilie n’ebe ahụ ndị Juda na ndị bi na Jeruselem gbakọrọ n’ụlọ Jehova, nọrọkwa n’ihu ogige a rụrụ ọhụrụ, 6 sị:
“Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà, ọ́ bụghị gị bụ Chineke bi n’eluigwe?+ Ọ́ bụghị gị na-achị alaeze mba niile?+ Ọ bụ gị na-enye ike, na-emekwa ka a bụrụ onye ukwu. O nweghị onye ga-emegide gị, ya agaziere ya.+
-