-
2 Ndị Eze 7:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ma, Ịlaịsha sịrị, “Nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova kwuru, sị: ‘N’ụdị oge a echi n’ọnụ ụzọ ámá* Sameria, otu sia* ntụ ọka e gwere nke ọma ga-ada otu shekel,* sia abụọ ọka bali juru ga-adakwa otu shekel.’”+ 2 Osote onyeisi ndị agha, onye eze tụkwasịrị obi, gwara onye nke ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na Jehova emeghee eluigwe, nri ezowe ka mmiri, ihe a ò nwere ike ime eme?”+ Ịlaịsha asị ya: “Ị ga-eji anya gị hụ ya,+ ma ị gaghị eri ya.”+
-