11 “Finihas+ nwa Elieza, nwa nwa Erọn onye nchụàjà, emeela ka iwe m na-ewesa ndị Izrel dajụọ n’ihi na o kweghị ka ha hapụ m fewe chi ọzọ.+ Ọ bụ ya mere na ebibighị m ndị Izrel n’agbanyeghị na m chọrọ ka ha na-efe naanị m.+
10 Ya asị: “Eji m ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha.+ Ma ndị Izrel ahapụla ọgbụgba ndụ gị.+ Ha akụtuola ebe ịchụàjà gị, jirikwa mma agha gbuo ndị amụma gị,+ ya afọzie naanị m. Ugbu a, ha na-achọ igbu m.”*+