16 Keleb wee sị: “Onye ọ bụla nke lụsoro Kiriat-sifa agha ma weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17 Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb, weghaara ya. N’ihi ya, Keleb kpọnyere ya Aksa nwa ya nwaanyị+ ka ọ bụrụ nwunye ya.