37 “Ọ bụ Mosis a gwara ndị Izrel, sị: ‘Chineke ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m.’+ 38 Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+