-
2 Samuel 8:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Toaị eze Hemat+ nụkwara na Devid emeriela ndị agha niile na-alụrụ Hadadiza agha.+ 10 N’ihi ya, Toaị ziri Joram nwa ya ka ọ gakwuru Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Toaị agha). Joram wetakwaara Devid ihe ndị e ji ọlaọcha, ọlaedo, na ọla kọpa mee. 11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a, ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri.+
-