-
1 Ihe E Mere 18:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe Tou* eze Hemat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile na-alụrụ Hadadiza+ eze Zoba+ agha, 10 o ziri Hedoram* nwa ya ozugbo ka ọ gakwuru Eze Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya, (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Tou agha). Hedoram wetakwaara Devid ụdị ihe niile e ji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa mee. 11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a,+ ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri, ya bụ, ndị Ịdọm, ndị Moab, ndị Amọn,+ ndị Filistia,+ na ndị Amalek.+
-