-
2 Samuel 10:1-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ka oge na-aga, Eze ndị Amọn+ nwụrụ, Henọn nwa ya anọchie ya, malite ịchị.+ 2 Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash na m hụrụ ya n’anya* n’ihi na nna ya gosiri m na ya hụrụ m n’anya.” N’ihi ya, Devid ziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa kasie ya obi maka nna ya nwụrụnụ. Ma, mgbe ndị na-ejere Devid ozi batara n’ala ndị Amọn, 3 ndị isi ndị Amọn gwara Henọn onyenwe ha, sị: “Ì chere na ihe mere Devid ji zite ndị ga-akasi gị obi bụ maka na ọ na-akwanyere nna gị ùgwù? Ihe mere o ji zite ha ọ́ bụghị ka ha nyopụta otú obodo a dị ma weghara ya?” 4 N’ihi ya, Henọn kpọọrọ ndị na-ejere Devid ozi kpụchapụ ọkara afụ ọnụ ha,+ chawaakwa uwe mwụda ha ruo n’ikè, hapụzie ha ka ha lawa. 5 Mgbe a kọọrọ Devid ihe a, o ziri ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa hụ ha, n’ihi na e menyere ha ezigbo ihere. Eze gwakwara ha, sị: “Nọrọnụ na Jeriko,+ afụ ọnụ unu rujuo, unu alọta.”
-