-
2 Samuel 10:9-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe Joab hụrụ na e si ihu na azụ na-abịa ịlụso ya agha, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị Izrel bụ́ ọkà n’ịlụ agha, hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Siria agha.+ 10 Ọ hapụkwaara Abishaị+ nwanne ya ndị fọrọnụ, ka ọ hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Amọn agha.+ 11 Ọ gwakwara Abishaị, sị: “Ndị Siria karịa m ike, gị abịa nyere m aka. Ma ndị Amọn karịa gị ike, mụ abịa nyere gị aka. 12 Ka anyị jisie ike, katakwa obi+ n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị. Jehova ga-emekwa uche ya.”+
-