13 Joab na ndị ya na ha so gaziri lụso ndị Siria agha, merie ha, ha agbaa ọsọ.+ 14 Mgbe ndị Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, hanwa gbakwara ọsọ n’ihi Abishaị, laghachi n’obodo ha. Mgbe agha ahụ biri, Joab si ebe ọ gara ịlụso ndị Amọn agha lọta Jeruselem.