-
2 Samuel 10:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ozugbo, ha esi n’Osimiri Jọdan gafee ruo Hilam. Ndị Siria hazikwara onwe ha n’usoro, malitekwa ịlụso Devid agha.+ 18 Ma ndị Izrel meriri ndị Siria, ha agbaa ọsọ. Devid gbukwara narị ndị Siria asaa (700) na-agba ụgbọ ịnyịnya na puku ndị Siria iri anọ (40,000) na-agba ịnyịnya. O gbukwara Shobak onyeisi ndị agha ha ebe ahụ.+ 19 Mgbe ndị eze niile, ndị na-ejere Hadadiza ozi, hụrụ na ndị Izrel emeriela ha, ha gakwuuru ndị Izrel ozugbo, ha na ha emee udo, ha aghọọ ndị ohu ha.+ Ụjọ ekweghịzi ndị Siria gaa nyere ndị Amọn aka ọzọ.
-