-
1 Ihe E Mere 19:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ozugbo, ha esi n’Osimiri Jọdan gafee chọrọ ndị Siria gaa ma hazie onwe ha n’usoro ịlụso ha agha. Mgbe Devid pụtara ịlụso ha agha, ha malitere ịlụso ya agha.+ 18 Ma ndị Izrel meriri ndị Siria, ha agbaa ọsọ. Devid gbukwara puku ndị Siria asaa (7,000) na-agba ụgbọ ịnyịnya na puku mmadụ iri anọ (40,000) ndị nke ji ụkwụ aga. O gbukwara Shofak onyeisi ndị agha ha. 19 Mgbe ndị na-ejere Hadadiza ozi hụrụ na ndị Izrel emeriela ha,+ ha gakwuuru Devid, ya na ha emee udo, ha aghọọ ndị ohu ya.+ Ndị Siria agaghịkwa nyere ndị Amọn aka ọzọ.
-