17 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kacha chi niile+ na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile, Chineke dị ebube, onye dị ike, na onye e kwesịrị ịna-atụ egwu, onye na-anaghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ naghịkwa anara aka azụ.*
19 Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi.+ Unu elela mmadụ anya n’ihu.+ Unu anakwala aka azụ n’ihi na ịna aka azụ na-emechi anya ndị ma ihe,+ na-emekwa ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ gbanwee okwu ha.