15 Kpachara anya ka gị na ndị bi n’ala ahụ ghara ịgba ndụ, n’ihi na mgbe ha ga-akpa àgwà ka ndị akwụna na-efe chi ha ma na-achụrụ chi ha àjà,+ ha ga-akpọ gị, ị ga-erikwa ihe ha ji chụọ àjà.+
8 Mgbe m hụrụ ihe o mere, m chụpụrụ Izrel na-enupụ isi, nye ya akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm kpamkpam+ n’ihi iko ọ kwara.+ Ma, Juda bụ́ nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ atụghị egwu. Kama, yanwa malitekwara ịga na-agba akwụna.+