-
2 Ihe E Mere 24:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 N’agbanyeghị na ndị agha Siria ndị lụsoro ha agha ehighị nne, Jehova nyefere imirikitiimi ndị agha+ Juda n’aka ha, n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha. Otú a ka ha* si kwụọ Jehoash ụgwọ ihe o mere. 25 Mgbe ha hapụrụ ya lawa (n’ihi na ha merụrụ ya ezigbote ahụ́ hapụ ya*), ndị na-ejere ya ozi gbaara ya izu maka na o gburu ụmụ* Jehoyada+ onye nchụàjà. Ha gburu ya ka o dina n’àkwà* ya.+ Ha likwara ya n’Obodo Devid,+ ma ha elighị ya ebe a na-eli ndị eze.+
-