-
2 Ndị Eze 16:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 N’ihi ya, Ehaz ziri ndị mmadụ ha agaa zie Tiglat-piliza+ eze Asiria, sị: “Abụ m ohu gị, bụrụkwa nwa gị. Bịa napụta m n’aka eze Siria nakwa n’aka eze Izrel, ndị na-alụso m agha.” 8 Ehaz nyeziri eze Asiria aka azụ.+ O nyere ya ọlaọcha na ọlaedo ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze.
-