6 Ma e nwere ụmụ nwoke na-adịghị ọcha maka na ha metụrụ ozu mmadụ* aka,+ nke mere na ha enweghị ike ịkwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’ụbọchị ahụ. N’ihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn n’ụbọchị ahụ,+
10 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụgodị na onye ọ bụla n’ime unu ma ọ bụ n’ọgbọ unu ndị na-esote unu adịghị ọcha maka na o metụrụ ozu mmadụ* aka+ ma ọ bụkwanụ na ọ gara ebe dị ezigbo anya, ọ ka ga-akwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga a na-emere Jehova.