-
1 Ndị Eze 8:65, 66Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
65 N’oge ahụ, Solomọn na ndị Izrel niile nọ n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị mee ememme+ ụbọchị asaa nakwa ụbọchị asaa ọzọ, ya bụ, ụbọchị iri na anọ. Ndị gbakọrọnụ hiri nne, malite na Libo-hemat* ruo na Ndagwurugwu* Ijipt.+ 66 N’ụbọchị na-esonụ,* ọ gwara mmadụ niile ka ha lawa, ha agọzie eze, laakwa n’ụlọ ha dị iche iche. Obi nọkwa na-atọ ha ụtọ, ha ana-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ihe ọma niile+ Jehova meere Devid bụ́ ohu ya na ndị Izrel bụ́ ndị ya.
-