-
Levitikọs 25:33, 34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 Ọ bụrụ na a zụrụghachighị ụlọ ndị Livaị e rere ere, bụ́ nke dị n’obodo ndị Livaị, a ga-enyeghachi onye nwebu ụlọ ahụ ụlọ ya n’afọ Nnwere Onwe,+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị ketara ụlọ ndị dị n’obodo ha n’Izrel.+ 34 A gaghịkwa ere ala ndị gbara obodo ha gburugburu, bụ́ ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa,+ n’ihi na ọ bụ nke ha mgbe niile.
-