7 Ana m abụ iwe ha na ọnụma ha ọnụ n’ihi na o mere ka ha mee ihe jọgburu onwe ya na ihe na-agbawa obi.+ Ka m kesaa ha n’ebe dị iche iche n’ala Jekọb, ka m meekwa ka ha gbasasịa n’ala Izrel.+
18“Ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị na ndị niile si n’ebo Livaị agaghị eketa òkè ma ọ bụ ala n’Izrel. Ha ga na-eri àjà Jehova ndị a na-esu ọkụ, nke bụ́ ihe o ketara.+
4 E weere na ụmụ Josef, bụ́ Manase na Ifrem,+ bụ ebo abụọ.+ E kenyeghịkwa ndị Livaị ala n’ala ahụ, ma e wezụga obodo ndị+ ha ga-ebi na ala anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa nakwa ebe ha ga na-akwasa ngwongwo ha.+