-
Jenesis 12:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Jehova wee pụta n’ihu Ebram, sị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a.”+ O wee rụọrọ Jehova, onye pụtara n’ihu ya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ. 8 Mgbe e mechara, o si n’ebe ahụ kwaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Betel+ ma maa ụlọikwuu n’ebe ahụ. Betel dị n’ebe ọdịda anyanwụ ebe ahụ ọ mara ụlọikwuu, E-aị+ adịrị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, malitekwa ịkpọku aha Jehova.+
-