27Mgbe o ruru n’ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye niile nke ndị Juu gbara izu ka e gbuo Jizọs.+2 Mgbe ha kechara ya agbụ, ha kpụụrụ ya pụọ, nyefee ya n’aka Paịlet, bụ́ gọvanọ.+
10 Ma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọ na-ebili, jiri iwe na-ebo ya ebubo. 11 Herọd na ndị agha ya kparịrị ya,+ yiwekwa ya uwe mara mma iji kwaa ya emo,+ mechazie kpụghachiri ya Paịlet.