11 Kama ala unu na-abanye iweghara bụ ala ugwu na ndagwurugwu juru na ya.+ Mmiri na-esikwa n’eluigwe ede ya.+12 Ọ bụ ala Jehova bụ́ Chineke unu na-elekọta. Anya Jehova bụ́ Chineke unu dị na ya mgbe niile, si ná mmalite afọ ruo ná ngwụcha afọ.
17 Ma, ihe ọma ndị ọ na-eme na-egosi unu ụdị onye ọ bụ.+ Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju,+ na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”+