31 Jehova, agbabala m n’ime gị.+
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
Napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
2 Gee m ntị.
Bịa ọsọ ọsọ napụta m.+
Bụrụ ugwu m na-agbaba na ya,
Ebe a rụsiri ike m na-agbaba ka a zọpụta m.+
3 N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
N’ihi aha gị,+ ị ga na-edu m ma na-ezi m ụzọ m ga-eso.+