35 Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị.+
Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.+
2 Okooko osisi ga-ejurịrị na ya.+
Ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ.
Ọ ga-adị ebube ka Lebanọn,+
Maakwa mma ka Kamel+ na Sharọn.+
Ndị mmadụ ga-ahụ ebube Jehova, ya bụ, otú Chineke anyị si maa mma dị ebube.