12 Onye ahụ gwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụla ihe ndị okenye Izrel na-eme n’ọchịchịrị, na onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ime ime ụlọ ya ebe o dowere arụsị a pịrị apị? N’ihi na ha na-asị, ‘Jehova anaghị ahụ anyị. Jehova ahapụla ala a.’”+
9 Ya asị m: “Mmehie ndị Izrel na Juda karịrị akarị.+ Ọbara ndị e gburu egbu juru n’ala ha.+ Mpụ jukwara n’obodo ha.+ Ha sịrị, ‘Jehova ahapụla ala a. Jehova anaghị ahụ anyị.’+