16 Jehova gwara Mosis, sị: “Lee, oge ị ga-anwụ* eruwela. Ndị a ga-amalitekwa ịkpa àgwà ka ndị akwụna hapụ m gaa fee chi ndị mba ọzọ gbara ha gburugburu n’ala ahụ ha na-aga.+ Ha ga-ahapụ m+ ma mebie ndụ mụ na ha gbara.+
20Ma e nwere otu nwoke, bụ́ onye isi ike, aha ya bụ Shiba.+ Ọ bụ nwa Bikraị, onye ebo Benjamin. Ọ fụrụ opi,+ sị: “O nweghị ihe jikọrọ anyị na Devid. O nweghịkwa ihe nwa Jesi+ anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya!”*+
26 “Ma, ha nupụụrụ gị isi, meere gị isi ike+ ma leghara Iwu gị anya.* Ha gburu ndị amụma gị ndị dọrọ ha aka ná ntị ka ha laghachikwute gị. Ha kpakwara àgwà ọjọọ ndị gosiri na ha ejighị gị kpọrọ ihe.+