6 Ndị Izrel malitere ọzọ ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Ha malitekwara ife Bel,+ Ashtọret, chi ndị Eram,* chi ndị Saịdọn, chi ndị Moab,+ chi ndị Amọn,+ na chi ndị Filistia.+ Ha hapụrụ Jehova, ha efeghịkwa ya.
17 Ozugbo Ehab hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ onye a, onye tinyere ndị Izrel ná nnukwu nsogbu?”
18 Ịlaịja asị ya: “Etinyeghị m ndị Izrel ná nsogbu, kama ọ bụ gị na ezinụlọ nna gị tinyere ndị Izrel ná nsogbu, n’ihi na unu kwụsịrị idebe iwu Jehova fewe Bel.+