2 Unu ga-ebibicha ebe niile mba ndị unu ga-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha dị iche iche,+ ma ọ̀ bụ n’ugwu ndị dị elu ma ọ̀ bụ n’obere ugwu ma ọ̀ bụ n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.
28 M kpọbara ha n’ala m ṅụrụ iyi na m ga-enye ha.+ Mgbe ha hụrụ ugwu niile dị elu na osisi ndị nwere akwụkwọ,+ ha malitere ịnọ ebe ahụ achụ àjà dị iche iche na-akpasu iwe. Ha na-anọ ebe ahụ achụ àjà na-esi ísì ọma na àjà mmanya.