18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ.+ Ọ sịrị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis,+
31 “M ga-eme ka ókè nke ala unu malite n’Oké Osimiri Uhie ruo n’oké osimiri ndị Filistia, malitekwa n’ala ịkpa ruo n’Osimiri Yufretis;+ n’ihi na m ga-enyefe ndị bi n’ala ahụ n’aka unu, unu ga-achụpụkwa ha.+
21 Solomọn nọkwa na-achị obodo niile dị malite n’Osimiri Yufretis+ ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt. Ha nọ na-atụrụ ya ụtụ, na-ejekwara ya ozi oge niile ọ dị ndụ.+