12 N’abalị iri n’ọnwa ise, n’afọ nke iri na itoolu n’ọchịchị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan onyeisi ndị nche, onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara Jeruselem.+ 13 Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova ma ụlọ eze ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama.