3 Jehova ga-akasi Zayọn obi.+
Ọ ga-eme ka ebe ya niile e bibiri ebibi dịghachi mma.+
Ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+
Meekwa ka ọzara ya dị ka ubi Jehova.+
Ndị bi na ya ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị.
A ga na-anụkwa olu ndị na-ekele Chineke na olu ndị na-abụ abụ n’ime ya.+