-
Daniel 9:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Mgbe m ka kpụ okwu a n’ọnụ ma na-ekpe ekpere ma na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị obodo m Izrel ma na-arịọ Jehova Chineke m arịrịọ ka o mee amara ma cheta ugwu nsọ ya,+ 21 mgbe ahụ m ka na-ekpe ekpere a, otu onye bịakwutere m. Ọ bụ Gebriel,+ onye ahụ m hụburu n’ọhụụ.+ Ọ bịakwutere m mgbe ike gwụcharala m, n’ihe dị ka n’oge e ji achụ àjà ná mgbede.
-