-
Ọrụ Ndịozi 2:25-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ọ bụ ya mere Devid ji kwuo gbasara ya, sị: ‘M mere ka Jehova* nọrọ n’ihu m mgbe niile. Ebe ọ bụ na ọ nọ m n’aka nri, e nweghị ihe ga-eme ka m daa.* 26 N’ihi ya, obi tọrọ m ụtọ, aṅụrị jukwara m obi ka m na-ekwu okwu. M* ga-enwekwa olileanya, 27 n’ihi na ị gaghị ahapụ m* n’ili,* ị gaghịkwa ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.+ 28 I meela ka m mara ụzọ ndụ, ị ga-emekwa ka ọṅụ ju m obi n’ihu gị.’+
-