-
Abụ Ọma 16:8-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 M mere ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.+
Ebe ọ bụ na ọ nọ m n’aka nri, e nweghị ihe ga-eme ka m daa.*+
9 N’ihi ya, obi na-atọ m ụtọ. Ana m enwe* ezigbo aṅụrị.
Ahụ́ rukwara m ala.
10 N’ihi na ị gaghị ahapụ m* n’ili.*+
Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike nọrọ n’ili.*+
11 Ị na-eme ka m mara ụzọ ndụ.+
Onye nọ n’ihu gị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.+
Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
-