-
Ọrụ Ndịozi 7:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 O wee si n’ala ndị Kaldia kwapụ, gaa biri na Heran. Mgbe nna ya nwụrụ,+ Chineke gwara ya ka o si ebe ahụ kwata n’ala a unu bi ugbu a.+ 5 Ma, o nyeghị ya ala ọ bụla n’ala a, ọbụnadị otu amaụkwụ. Kama o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a nakwa na ọ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke nwa* ya ga-anọchi ya.+ O kwere ya nkwa a n’agbanyeghị na ọ mụtabeghị nwa.
-