17Mgbe Ebram dị afọ iri itoolu na itoolu, Jehova pụtara n’ihu Ebram, sị ya: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Mewe ihe dị m mma,* bụrụkwa onye a na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.
8 M ga-enyekwa gị na umụ* gị ala ahụ i biri mgbe ị bụ onye mbịarambịa,+ ya bụ, ala Kenan niile. M ga-enye ya unu ka ọ bụrụ nke unu ruo mgbe niile. M ga-abụkwa Chineke ha.”+
13 Ndị a niile nwere okwukwe ruo mgbe ha nwụrụ, n’agbanyeghị na nkwa ndị ahụ emezughị n’oge ha.+ Ma, ọ dị ha ka à ga-asị na ha ahụla ka nkwa ndị ahụ mezuru+ ma nabata ha. Ha kwusakwara n’ihu ọha na ha bụ ndị mbịarambịa na ndị bịara ịnọ obere oge n’ala ha bi.