-
Ọnụ Ọgụgụ 25:11-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “Finihas+ nwa Elieza, nwa nwa Erọn onye nchụàjà, emeela ka iwe m na-ewesa ndị Izrel dajụọ n’ihi na o kweghị ka ha hapụ m fewe chi ọzọ.+ Ọ bụ ya mere na ebibighị m ndị Izrel n’agbanyeghị na m chọrọ ka ha na-efe naanị m.+ 12 N’ihi ya, kwuo, sị, ‘Mụ na ya ga-agba ọgbụgba ndụ udo. 13 Ọ ga-abụrụ ya na ụmụ ya ndị ga-anọchi ya ọgbụgba ndụ ga-adịte aka nke ga-eme ka ha na-abụ ndị nchụàjà mgbe niile+ maka na o kweghị ka ndị Izrel hapụ Chineke ya fewe chi ọzọ.+ O kpuchikwaara ha mmehie ha.’”
-