14 M ga-adị ka ọdụm n’anya Ifrem,
M ga-adịkwa ka ọdụm siri ike n’anya ndị Juda.
M ga-adọrisị ha.+ M ga-agakwa buru ha.
O nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+
15 M ga-alaghachi ebe m si ruo mgbe ha ji isi ha buru ihe ha metara.
Ha ga-achọkwa ka m meere ha amara.+
Mgbe ihe siiri ha ike, ha ga-achọ m.”+