43 Ọ jụziri ha, sị: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kpọọ ya Onyenwe m, sị, 44 ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị nọrọ n’okpuru ụkwụ gị”’?+
42 N’ihi na Devid kwuru n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m 43 ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ.”’+
34 N’eziokwu, Devid agaghị eluigwe, ma ọ sịrị, ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m 35 ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ.”’+
3 Ọ bụ onyinyo ebube Chineke.+ O yikwara nnọọ Chineke,+ ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị. Mgbe ọ sachapụchara mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri Onye Ukwu ahụ, n’ebe dị elu.+
12 Ma nwoke a chụrụ otu àjà maka mmehie, bụ́ àjà ga-adịru mgbe niile, nọrọzie ala n’aka nri Chineke.+13 Malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-eche ruo mgbe a ga-eme ka ndị iro ya bụrụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ.+