-
Diuterọnọmi 17:18-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Mgbe ọ ga-anọrọ n’ocheeze n’alaeze ya, ọ ga-elere anya n’akwụkwọ Iwu a, nke ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị ji, depụtara onwe ya Iwu a n’akwụkwọ.*+
19 “Ọ ga-ejide akwụkwọ ahụ, ọ ga na-agụkwa ya n’oge niile ọ dị ndụ,+ ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke ya, na-emekwa ihe niile e kwuru n’Iwu a ma soro ntụziaka ndị a.+ 20 Ọ bụrụ na o mee ihe a, ọ gaghị eche na ya ka ụmụnne ya mma, ọ gaghịkwa ahapụ ihe ndị a e nyere n’iwu mewe ihe ọzọ, ka o wee chịtee aka n’alaeze ya n’Izrel, ma ya ma ụmụ ya.
-