5 O wee gwa Kora na ndị niile na-akwado ya, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ onye nke ya+ na onye dị nsọ na onye ga na-abịa ya nso.+ Ọ bụ onye ọ bụla ọ họọrọ+ ga na-abịa ya nso.
35 ‘E nweghị otu onye n’ime ụmụ nwoke so n’ọgbọ ọjọọ a ga-ahụ ezigbo ala ahụ m ṅụrụ iyi na m ga-enye nna nna unu hà,+36 ma e wepụ Keleb nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ya. M ga-enyekwa ya na ụmụ ya ala ahụ ọ gara na ya n’ihi na o ji obi ya niile soro Jehova.+