6 N’ihi na ọ bụ Chineke sịrị: “Ka ìhè si n’ọchịchịrị nwuo.”+ O sila n’ihu Kraịst mee ka ìhè nwuo n’obi anyị.+ Ìhè ahụ bụ ịma ihe ndị dị ebube gbasara Chineke.
19 Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu. Ọ dị mma na unu na-echebara amụma ndị a echiche. N’ime obi unu, ha ga-adị ka ọkụ*+ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, nke na-enwugide ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ apụta.