1 Samuel 16:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Samuel wee were mpi mmanụ ahụ+ tee ya mmanụ n’ihu ụmụnne ya. Mmụọ Jehova malitekwara inye Devid ike pụrụ iche si n’ụbọchị ahụ gawa.+ Samuel mechakwara bilie lawa Rema.+ 2 Samuel 22:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya. Ọ bụ ọta m+ na mpi* nke na-azọpụta m.* Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m,+Ọ bụ ebe m na-agbaga ọsọ ndụ+ na onye nzọpụta m.+ Ọ na-anapụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo. Abụ Ọma 20:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 Ugbu a, amarala m na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+ Ọ na-esi n’eluigwe ya dị nsọ za ya,Wee jiri aka ya siri ike* zọpụta ya.+
13 Samuel wee were mpi mmanụ ahụ+ tee ya mmanụ n’ihu ụmụnne ya. Mmụọ Jehova malitekwara inye Devid ike pụrụ iche si n’ụbọchị ahụ gawa.+ Samuel mechakwara bilie lawa Rema.+
3 Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya. Ọ bụ ọta m+ na mpi* nke na-azọpụta m.* Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m,+Ọ bụ ebe m na-agbaga ọsọ ndụ+ na onye nzọpụta m.+ Ọ na-anapụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo.
6 Ugbu a, amarala m na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+ Ọ na-esi n’eluigwe ya dị nsọ za ya,Wee jiri aka ya siri ike* zọpụta ya.+